Matiu 2

Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.

Matthew 2:16 (UKJV) Then Herod, when he saw that he was mocked of the wise men, was exceeding angry, and sent forth, and slew all the children that were in Bethlehem, and in all the coasts thereof, from two years old and under, according to the time which he had diligently enquired of the wise men.

14Nʼoge abalị, Josef biliri kpọrọ Meri na nwantakịrị ahụ gbalaa Ijipt.

15Ebe ahụ ka ha nọgidere tutu ruo mgbe Herọd nwụrụ. Nke a mere ka okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. “Ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.”

16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.

17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,

18“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.