16Iwe were Herọd nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na ndị amamihe ahụ aghọọla ya aghụghọ. Nʼihi ya, o nyere iwu banyere Betlehem na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, ka ha gbuo ụmụntakịrị niile nọ nʼobodo ndị a, bụ ndị gbara site nʼafọ abụọ gbadaa, dị ka ihe ọ nụtara site nʼọnụ ndị amamihe si dị.
17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
18“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”
19Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt
20sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”