17E sitekwara otu a mezuo amụma ahụ Jeremaya buru sị,
18“A nụrụ otu olu na Rema, ịkwa akwa na oke iru ụjụ dị, Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya; ọ dịghị nkasiobi ọbụla dịrị ya, nʼihi na ha adịghịkwa.”
19Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nʼIjipt
20sị ya, “Bilie, kpọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya laghachi nʼala Izrel nʼihi na ndị na-achọ igbu ya anwụọla.”
21Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel.