Matiu 21

Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.

Matthew 21:14 (UKJV) And the blind and the lame came to him in the temple; and he healed them.

12Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.

13Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’”

14Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.

15Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.

16Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.