14Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha.
15Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.
16Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ ?”
17Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.
18Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.