Matiu 21

Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.

Matthew 21:18 (UKJV) Now in the morning as he returned into the city, he hungered.

16Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’ ?”

17Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile.

18Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.

19Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.

20Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.