27“Ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu yiri ili e tere nzu, nke na-egosi onwe ya dị ka ihe mara mma, ma ime ya jupụtara nʼọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ, na ihe niile na-adịghị ọcha.
28Nʼụzọ dị otu a, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume, ma nʼime unu, unu jupụtara nʼihu abụọ na ndị ajọ omume.
29“E, ahụhụ ga-adịrị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-ewu ili ndị amụma na-ewerekwa ihe ịchọ mma na-edozi nkume ncheta ndị ezi omume.
30Unu na-asịkwa, ọ bụrụ na anyị nọ nʼoge nna anyị ha, anyị agaraghị eso ha wufuo ọbara ndị amụma.
31Site nʼụzọ dị otu a, unu na-agba akaebe megide onwe unu na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma.