Matiu 25

“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị.

Matthew 25:24 (UKJV) Then he which had received the one talent came and said, Lord, I knew you that you are an hard man, reaping where you have not sown, and gathering where you have not scattered:

22“Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, ‘Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.’

23“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ị ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.’

24“Onye e nyere otu talenti batara sị, ‘Nna anyị ukwu, amaara m onye ị bụ. Ị bụ onye aka ntagide. Ị na-ewe ihe ubi nʼebe ị na-akụghị mkpụrụ. Ị na-achịkọtakwa nʼebe ị na-agbasaghị.

25Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.’

26“Nna ya ukwu zara ya sị, ‘Ohu ọjọọ na onye umengwụ. Ị maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.