32Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.
33Ọ ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nʼakụkụ aka nri ya, ma ụmụ ewu ga-anọ nʼaka ekpe ya.
34“Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ nʼaka nri ya, ‘Batanụ nʼime alaeze, unu ndị Nna m gọziri agọzi, batanụ nʼime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.
35Nʼihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nri. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m ihe ọṅụṅụ. Mgbe m bụ ọbịa unu kpọbatara m.
36Mgbe m gba ọtọ, unu zụtara uwe nye m. Mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nʼụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.’