38Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị gba ọtọ anyị enye gị uwe?
39Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nʼọrịa, maọbụ nʼụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’
40“Eze ahụ ga-azaghachi ha sị, ‘Nʼezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nʼime ndị a dị nta nʼime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.’
41“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.
42Nʼihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọbụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ, unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.