1Mgbe chi bọrọ, ndịisi nchụaja niile na ndị okenye gbara izu megide Jisọs otu ha ga-esi gbuo ya.
2Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ.
3Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ.
4Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”