Matiu 27

Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.

Matthew 27:62 (UKJV) Now the next day, that followed the day of the preparation, the chief priests and Pharisees came together unto Pilate,

60ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.

61Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.

62Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.

63Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.

64Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị na-eche ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ozu ya. Ka ha ghara ị sịkwa ndị mmadụ na o sitela nʼọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.