Matiu 27

Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.

Matthew 27:61 (UKJV) And there was Mary Magdalene, and the other Mary, sitting opposite to the tomb.

59Josef buuru ozu ya, were ezi akwa ọcha linin na-enwu enwu fụchie ya,

60ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.

61Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọ na-ebe ahụ, ha nọdụrụ ala na ncherita ihu ili ahụ.

62Nʼechi ya, nke bụ ụbọchị na-eso ụbọchị Nkwadebe, ndịisi nchụaja na ndị Farisii zukọrọ jekwuru Pailet.

63Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.