Matiu 28

Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.

Matthew 28:17 (UKJV) And when they saw him, they worshipped him: but some doubted.

15Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.

16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.

17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.

18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.

19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.