13sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’
14Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.”
15Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.
16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.
17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.