Matiu 28

sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’

Matthew 28:13 (UKJV) Saying, Say all of you, His disciples came by night, and stole him away while we slept.

11Mgbe ha na-aga, ụfọdụ ndị agha chere ili ahụ nche batara nʼime obodo. Ha gara kọọrọ ndịisi nchụaja ihe niile mere.

12Emesịa, ndị nchụaja na ndị okenye zukọtara kwekọrịtaa inye ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego,

13sị ha, “Ihe a ka unu ga-ekwu, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼabalị zuru ya nʼohi mgbe anyị nọ na-arahụ ụra.’

14Ọ bụrụ na nke a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-emeta ya mma, ma mee ka unu pụọ na nsogbu.”

15Ha naara ego ahụ, meekwa dị ka e ziri ha. Akụkọ a ka a gbasara nʼetiti ndị Juu ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.