1Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.
2Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
3Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.”
4Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”
5Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu,