Matiu 5

Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.

Matthew 5:35 (UKJV) Nor by the earth; for it is his footstool: neither by Jerusalem; for it is the city of the great King.

33“Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’

34Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.

35Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.

36Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji.

37Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.