Matiu 5

“Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’

Matthew 5:33 (UKJV) Again, all of you have heard that it has been said by them of old time, You shall not renounce swearing yourself, but shall perform unto the Lord yours oaths:

31“E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’

32Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

33“Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’

34Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.

35Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.