Matiu 6

Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.

Matthew 6:8 (UKJV) Be not all of you therefore like unto them: for your Father knows what things all of you have need of, before all of you ask him.

6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.

7Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwukwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na a ga-anụ ekpere ha nʼihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.

8Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.

9“Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.

10Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.