8Unu adịla ka ha. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọbụla, Nna unu bi nʼeluigwe maara ihe na-akpa unu.
9“Sinụ otu a na-ekpe ekpere: “ ‘Nna anyị nke bi nʼeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.
10Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nʼụwa, dịka e si eme ya nʼeluigwe.
11Nye anyị nri nke ụbọchị taa.
12Gbaghara anyị mmehie anyị, dịka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.