11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla imegide gị; na-asị, “Ka e merụọ ya ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”
12Ma ha amaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị, ha aghọtakwaghị nzube ya, na ọ chịkọtala ha dịka ukwu ọka, na-ebuga ha nʼebe ịzọcha ọka.
13“Bilie, zọchaa, gị nwaada Zayọn, nʼihi na aga m enye gị mpi igwe. Aga m enyekwa gị ụkwụ ọla bronz, ị ga-etijisikwa ọtụtụ mba. Uru ha niile, nke ha nwetara nʼụzọ na-ezighị ezi, ka ị ga-enye Onyenwe anyị. Akụnụba ha ka ị ga-enyekwa Chineke nwe ụwa niile.”