7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ, meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike. Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ, ugwu nke nwaada Zayọn, ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị; bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”
9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike? Ọ bụ na i nweghị eze? Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme?
10Susie ude ike, gị nwaada Zayọn, dịka ịsụ ude nke nwanyị ime na-eme, nʼihi na unu aghaghị ịhapụ obodo a jee biri nʼọhịa. Unu aghaghị ịga Babilọn, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka a ga-esi napụta unu. Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-agbapụta unu site nʼaka ndị iro unu.
11Ugbu a, ọtụtụ mba ezukọọla imegide gị; na-asị, “Ka e merụọ ya ka anya anyị ṅụọ Zayọn.”