Maika 4

Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ, meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike. Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

Micah 4:7 (UKJV) And I will make her that halted a remnant, and her that was cast far off a strong nation: and the LORD shall reign over them in mount Zion from henceforth, even for ever.

5Mba dị iche iche ga-agagharị nke ọbụla nʼaha chi ya, ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.

6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “aga m achịkọta ndị ngwụrọ, chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ, na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ.

7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ, meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike. Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

8Ma gị, ebe nche e wuliri elu maka igwe atụrụ, ugwu nke nwaada Zayọn, ọchịchị a na-achị na mbụ ga-adịghachikwara gị; bụ ọchịchị nke dịrị nwaada Jerusalem.”

9Gịnị mere i ji na-akwasị akwa ike? Ọ bụ na i nweghị eze? Onye ndụmọdụ gị ọ nwụọla nke mere na ihe ụfụ jidere gị dịka nwanyị ime na-eme?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.