Maika 4

Mba dị iche iche ga-agagharị nke ọbụla nʼaha chi ya, ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.

Micah 4:5 (UKJV) For all people will walk every one in the name of his god, and we will walk in the name of the LORD our God for ever and ever.

3Ọ ga-ekpe ikpe dị nʼetiti ndị dị iche iche, doziekwa esemokwu dị nʼetiti mba na mba ibe ya ruo ebe dị anya. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile, mee ka ha bụrụ mma oge, kpụgharịkwa ùbe ha ka ha ghọọ mma ịkwacha osisi. Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ, maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.

4Onye ọbụla ga-anọdụrụ onwe ya nʼokpuru vaịnị na nʼokpuru osisi fiig ya, nʼihi na o nweghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu ọzọ. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya.

5Mba dị iche iche ga-agagharị nke ọbụla nʼaha chi ya, ma anyị onwe anyị ga na-aga nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.

6“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “aga m achịkọta ndị ngwụrọ, chịkọtaa ndị ahụ niile e mere ka ha biri na mba ọzọ, na ndị ahụ niile m mere ka ha ruo ụjụ.

7Aga m eme ka ndị ngwụrọ ahụ ghọọ ndị fọdụrụ ndụ, meekwaa ka ndị ahụ a chụpụrụ achụpụ ghọọ mba dị ike. Onyenwe anyị ga-esi nʼugwu Zayọn chịa ha site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.