Maika 5

“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”

Micah 5:2 (UKJV) But you, Bethlehem Ephratah, though you be little among the thousands of Judah, yet out of you shall he comes forth unto me that is to be ruler in Israel; whose activities forth have been from of old, from everlasting.

1Ugbu a doo ndị agha gị nʼusoro, gị obodo nke usuu ndị agha, nʼihi na e jirila mgbidi gbaa gị gburugburu ibuso gị agha. Ha ga-eji mkpara tie onyendu Izrel na nti.

2“Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata, ọ bụ ezie na ị bụ obodo dị nta nʼetiti ndị ikwu Juda niile, ma onye ahụ ga-achị Izrel ga-esi na gị pụta, bụ onye ahụ mmalite ya sitere na mgbe ochie, sitekwa na mgbe ebighị ebi gara aga.”

3Ya mere, a ga-arara ha nye tutu ruo mgbe onye ahụ ime na-eme mụpụtara nwa ya. Mgbe ahụ, ụmụnna ya niile ahụ fọdụrụ ga-alọghachikwuru ndị Izrel.

4Ọ ga-eguzo zụọ igwe ewu na atụrụ ya, site nʼike nke Onyenwe anyị, na site nʼịdị ukwuu nke aha Onyenwe anyị Chineke ya. Ndị ya ga-anọkwa na-enweghị nsogbu, nʼihi na ịdị ukwuu ya ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.