Maika 7

Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.

Micah 7:10 (UKJV) Then she that is mine enemy shall see it, and shame shall cover her which said unto me, Where is the LORD your God? mine eyes shall behold her: now shall she be trodden down as the mire of the streets.

8Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m.

9Nʼihi na m emehiela megide ya, aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m, mee ka m guzosie ike. Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè; aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya.

10Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.

11Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.

12Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.