1Ahụhụ dịrị m! Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị, mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị. O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta, o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike
2Ndị ezi omume agwụla nʼụwa, ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ. Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara, ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya.
3Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.
4Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.