Nehum 2

Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.

Nahum 2:12 (UKJV) The lion did tear in pieces enough for his whelps, and strangled for his lionesses, and filled his holes with prey, and his dens with ravin.

10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.

11Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?

12Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.

13“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. A gaghị anụkwa olu ndị ozi gị ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.