8Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
9Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.
10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
11Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?
12Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.