Nehum 2

Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.

Nahum 2:8 (UKJV) But Nineveh is of old like a pool of water: yet they shall flee away. Stand, stand, shall they cry; but none shall look back.

6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.

7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.

8Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.

9Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.

10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.