4Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.
5Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro.
6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.
8Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.