5“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Aga m ekpughepụ uwe gị, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gosi mba niile nke ụwa ọtọ gị. Ihere ga-emekwa gị nʼihu alaeze niile.
6Aga m awụkwasị gị ihe arụ dị iche iche, meso gị mmeso onye e ledara anya, mekwaa ka ị bụrụ ihe ilere anya nye mmadụ niile.
7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”
8Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
9Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.