7Ndị niile hụrụ gị ga-agbara gị ọsọ na-asị, ‘Ninive aghọọla ihe lara nʼiyi, onye ga-eru ụjụ nʼihi ya?’ Ebee ka m ga-achọta onye ga-akasị gị obi?”
8Ị dị mma karịa Tibs, bụ obodo dị nʼọnụ mmiri Naịl, nke mmiri gbara gburugburu? Osimiri ahụ bụ ihe o ji echebe onwe ya, mmiri ahụ bụkwa mgbidi gbara ya gburugburu.
9Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.
10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.
11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke, ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.