Nehum 3

Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke, ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.

Nahum 3:11 (UKJV) You also shall be drunken: you shall be hid, you also shall seek strength because of the enemy.

9Kush na Ijipt bụ agbamume ya nke na-enweghị ọgwụgwụ, Put na Libịa sokwa bụrụ ndị enyemaka ya.

10Ma otu ọ dị, ebugara ya nʼala ndị ọzọ dịka ohu a dọtara nʼagha. A tụpịasịrị ụmụ ya a mụrụ ọhụrụ nʼelu nkume, nke dị nʼisi okporoụzọ ya niile. E fekwara nza iji kesaa ndị ya niile a na-asọpụrụ, e kekwara ndị ukwu ya niile mkpọrọ igwe.

11Gị onwe gị ga-aṅụbigakwa mmanya oke, ị ga-abụ onye zoro onwe ya ezo, ma chọkwa ebe mgbaba nʼihi ịgbanarị ndị iro gị.

12Ebe gị niile e wusiri ike dịka osisi fiig nke mkpụrụ mbụ ya chara nʼelu ya. Ma mgbe a kwagharịrị ya mkpụrụ ndị ahụ na-adaba nʼọnụ onye na-eri ya.

13Lee ndị agha gị, ha niile bụ ụmụ nwanyị nʼetiti gị. E megheela ọnụ ụzọ ama nke ala gị niile nye ndị iro gị. Ọkụ erepịakwala na mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ unu niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.