Nehemaya 11

Juel nwa Zikri bụ onyeisi ha. Juda nwa Hasenua bụ onye na-eso ya, na onye na-achị akụkụ ọhụrụ nke obodo ahụ.

Nehemiah 11:9 (UKJV) And Joel the son of Zichri was their overseer: and Judah the son of Senuah was second over the city.

7Ndị sitere nʼagbụrụ Benjamin bụ, Salu nwa Meshulam, nwa Joed, nwa Pedaia, nwa Kolaya, nwa Maaseia, nwa Itiel, nwa Jeshaya,

8ya na ndị na-eso ya bụ ụmụ Gabai na Salai. Ọnụọgụgụ ha dị narị itoolu na iri abụọ na asatọ (928).

9Juel nwa Zikri bụ onyeisi ha. Juda nwa Hasenua bụ onye na-eso ya, na onye na-achị akụkụ ọhụrụ nke obodo ahụ.

10Ndị sitere nʼetiti ndị nchụaja bụ, Jedaya nwa Joiarib, na Jakin,

11na Seraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, nwa Meraiot, nwa Ahitub onye na-elekọta ụlọ ukwuu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.