24Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.
25Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.
26Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.
27Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.
28Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa,