Nehemaya 12

Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.

Nehemiah 12:24 (UKJV) And the chief of the Levites: Hashabiah, Sherebiah, and Jeshua the son of Kadmiel, with their brethren opposite to them, to praise and to give thanks, according to the commandment of David the man of God, ward opposite to ward.

22E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa.

23E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ.

24Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu.

25Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub.

26Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.