27Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”
28Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.
29Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.
30Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.
31Emekwara m ka a na-ebubata nkụ nke ebe ịchụ aja nʼoge kwesiri, meekwa ka a na-ewebata onyinye mkpụrụ mbụ niile nʼoge ha. Cheta m Chineke, gosi m ihuọma gị.