Nehemaya 13

Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.

Nehemiah 13:28 (UKJV) And one of the sons of Joiada, the son of Eliashib the high priest, was son in law to Sanballat the Horonite: therefore I chased him from me.

26Ọ bụghị ọlụlụ di na nwunye dị otu a wetara ọdịda Solomọn? O nweghị eze ọzọ dị na mba ọbụla a pụrụ iji tụnyere Solomọn, nʼihi na Chineke ya hụrụ ya nʼanya mee ya eze ndị Izrel niile. Ma ọ bụ ndị nwunye mba ọzọ ọ lụrụ dubara ya na mmehie ikpere arụsị.

27Ugbu a, ọ bụ ka anyị gere na ntị na unu onwe unu na-emekwa ajọ ihe dị otu a, na unu ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke anyị, site nʼịlụ ndị inyom ndị mba ọzọ?”

28Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.

29Cheta ha, Chineke m, nʼihi na ha merụrụ ọrụ nchụaja, na ọgbụgba ndụ ọrụ nchụaja, na nke ndị Livayị.

30Ya mere, e doro m ndị nchụaja, na ndị Livayị ọcha, wezugakwa ihe ọbụla nke na-ekwesighị nʼebe ha nọ. E kenyere m ha ọrụ, onye ọbụla nʼije ozi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.