Nehemaya 2

Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.

Nehemiah 2:10 (UKJV) When Sanballat the Horonite, and Tobiah the servant, the Ammonite, heard of it, it grieved them exceedingly that there was come a man to seek the welfare of the children of Israel.

8Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m.

9Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m.

10Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka.

11E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ,

12eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.