Nehemaya 2

Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.

Nehemiah 2:15 (UKJV) Then went I up in the night by the brook, and viewed the wall, and turned back, and entered by the gate of the valley, and so returned.

13Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere.

14Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.

15Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.

16Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.

17Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.