14Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee.
15Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu.
16Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ.
17Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.”
18Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya. Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge.