1Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze.
2Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.” Ụjọ tụrụ m nnọọ nke ukwu.
3Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?”
4Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?” Mgbe ahụ ekpere m ekpere nʼobi m nye Chineke,
5ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.”