Nehemaya 3

Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.

Nehemiah 3:1 (UKJV) Then Eliashib the high priest rose up with his brethren the priests, and they built the sheep gate; they sanctified it, and set up the doors of it; even unto the tower of Meah they sanctified it, unto the tower of Hananeel.

1Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.

2Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.

3Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.