Nehemaya 3

Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.

Nehemiah 3:2 (UKJV) And next unto him built the men of Jericho. And next to them built Zaccur the son of Imri.

1Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ.

2Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko.

3Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.

4Meremot, nwa Ụraya, nwa Hakoz, rụziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Onye na-eso ya bụ Meshulam, nwa Berekaya, nwa Meshezabel, rụziri mgbidi, onye na-esota ya bụ Zadọk nwa Baana, onye rụzikwara mgbidi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.