14Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha.
15Shalum nwa Kol-Hoze, onyeisi ọchịchị ala dị Mizpa gburugburu, wuziri ọnụ ụzọ ama isi iyi, kpuchie elu ya, tinye ya ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. O mezikwara mgbidi ahụ site nʼọdọ mmiri Siloam ruo nʼubi eze a gbara ogige, na ruokwa na nkwasa nrịda dị site nʼobodo Devid ma e site Jerusalem na-apụta.
16Onye na-eso ya bụ Nehemaya nwa Azbuk, onyeisi ọchịchị ọkara nʼime Bet Zoa. O wuziri mgbidi ahụ ruo ncherita ihu ebe ili Devid, ruokwa ọdọ ebe emere maka ichekọta mmiri, na nʼỤlọ ndị Dike nʼagha.
17Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya.
18Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara.