20Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja.
21Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya.
22Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya.
23Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya.
24Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ.