Nehemaya 3

Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.

Nehemiah 3:31 (UKJV) After him repaired Malchiah the goldsmith's son unto the place of the Nethinims, and of the merchants, opposite to the gate Miphkad, and to the going up of the corner.

29Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.

30Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.

31Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.

32Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.