27Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso.
28Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya.
29Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota.
30Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya.
31Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ.